Luke 4:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs mechiri akwụkwọ ahụ nyekwa ya onyeisi ụlọ ekpere ahụ, nọdụ ala. Ndị mmadụ nile nọ nꞌụlọ ekpere ahụ legidere ya nnọọ anya.
Igbo 2006
O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n'ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya.