Luke 4:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ka m gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọ bụla a na-anara nke ọma nꞌobodo nke aka ya. Chetakwanụ ihe mere nꞌoge Ịlaịja onye amụma. E nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị e kwesịrị inyere aka nꞌoge ụnwụ ahụ, mgbe mmiri na-ezoghị nꞌala Izirel afọ atọ na mkpirisi.
Igbo 2006
O we si, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n'obodo nke aka ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya.