Luke 4:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Chineke ezigaghị Ịlaịja inyere onye ọ bụla nꞌime ha aka. Kama Chineke zigara Ịlaịja ka ọ gaa nꞌala Saidọn nyere otu nwanyị onye mba ọzọ di ya nwụrụ anwụ aka.
Igbo 2006
Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii.