Luke 4:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ gị si nꞌime ya pụta!” Mmụọ ọjọọ ahụ tụrụ nwoke a nꞌala nꞌihu ndị nọ nꞌebe ahụ, site nꞌime nwoke ahụ pụta, ma o merụghị ya ahụ.
Igbo 2006
Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mb͕e mọ ọjọ ahu tudasiri ya n'ala n'etiti ha, o we si nime ya puta, nēmerughi ya aru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ.