Luke 4:36 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a juru mmadụ nile anya mee ka ha sịrịta onwe ha, “Gịnị dị nꞌokwu ọnụ nwoke a, lee na o ji ike na-enye mmụọ ọjọọ ndị a iwu, ha na-apụkwa!”
Igbo 2006
Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Gini bu okwu a? n'ihi na O ji ichi-isi na ike nye ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha we puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!”