Luke 4:40 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌụbọchị ahụ kwa, nꞌoge anyasị, ndị nile nwere enyi nke ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, buteere ha Jisọs ka ọ gwọọ ha. O bikwasịrị ha aka gwọọ ha.
Igbo 2006
Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha.