Luke 4:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌisi ụtụtụ echi ya, Jisọs si nꞌụlọ Saimọn pụọ gaa ebe ọ ga-anọrọ onwe ya. Mgbe chi bọrọ ndị mmadụ bidoro ịchọgharị ya. Mgbe ha hụrụ ya, ha rịọrọ ya ka ọ ghara ịhapụ ha kama ka o soro ha nọdụ na Kapanọm.
Igbo 2006
Ma mb͕e chi bọrọ, Ọ pua ga n'ebe bu ọhia: igwè madu nile we nāchọ Ya, we biakute Ya, malite kwa ib͕ochi Ya, ka Ọ ghara isi na nke ha ga ebe ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha.