Luke 5:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Emesịa, mgbe Jisọs bịarutere otu obodo, o zutere otu nwoke onye ekpenta. Mgbe nwoke a hụrụ Jisọs, ọ bịakwutere ya daa nꞌala nꞌihu ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”
Igbo 2006
O rue, mb͕e Ọ nọ n'otù nime obodo ahu, le, otù nwoke nke ekpenta juputara n'aru: ma mb͕e ọ huru Jisus o da kpuchie iru-ya n'ala, riọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.”