Luke 5:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs dọrọ nwoke ahụ aka na ntị sị ya, “Agwakwala onye ọ bụla ihe m meere gị. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, nyekwa onyinye Mosisi nyere nꞌiwu na ndị a gwọrọ ọrịa ekpenta ga-enye, igosi ndị mmadụ na a gwọọla gị ugbu a.”
Igbo 2006
Ya onwe-ya we nye ya iwu ka ọ ghara igwa onye ọ bula: Ọ si kwa ya, Kama laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha, dika Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”