Luke 5:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ụbọchị, mgbe Jisọs nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ụfọdụ nꞌime ndị Farisii na ndị ozizi iwu sokwara igwe mmadụ Jisọs na-ezi ihe nọdụ na-ege ntị. (Ọtụtụ mmadụ ndị a si nꞌobodo nta nile dị na Galili na Judia na Jerusalem bịakwute Jisọs.) Ike Chineke dịnyekwaara Jisọs nꞌụbọchị ahụ ịgwọ ndị ọrịa.
Igbo 2006
O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n'obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa.