Luke 5:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma nke a ekweghị ha omume, nꞌihi na igwe mmadụ gbara Jisọs gburugburu. Ya mere, ndị a rigoro elu ụlọ ahụ Jisọs nọ nꞌime ya, dọkapụ ụfọdụ nꞌime ute e jiri kpuchie ụlọ ahụ. Ha kenyere eriri nꞌute ahụ enyi ha dina, site nꞌoghere ha mere nꞌelu ụlọ ahụ, wetuo nwoke ahụ. Ha mere ka nwoke ahụ nwee ike ịbịa nso ebe Jisọs nọ nꞌetiti igwe mmadụ ahụ gbara ya gburugburu.
Igbo 2006
Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha na-enweghị ike ime nke a nʼihi igwe mmadụ, ha rigooro nʼelu ụlọ, site nʼoghere wetuo nwoke ahụ nʼute ya nʼetiti igwe mmadụ nʼihu Jisọs.