Luke 5:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a aga m egosi unu na Nwa nke mmadụ nwere ike nꞌụwa ịgbaghara mmehie site nꞌigosi unu ike m nwere ịgwọ ọria.” Jisos chigharịrị gwa onye ọrịa ahu okwu sị “Nwoke, bilie, chịrị ute gị laa nꞌụlọ gi!”
Igbo 2006
Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (Ọ si onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, laa n'ulọ gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ka unu mata na Nwa nke Mmadụ nwere ikike nʼụwa ịgbaghara mmehie.” Ọ sịrị onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Asị m gị, bilie, chịrị ute gị laa nʼụlọ gị!”