Luke 5:30 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ndị Farisii na ndị ozizi iwu hụrụ ka Jisọs so Livayị na ndị enyi ya na-eri nri, ha bidoro na-ajụ ndị na-eso ụzụ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere unu na nna unu ukwu ji na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri?”
Igbo 2006
Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ-ha we tamube imegide ndi nēso uzọ-Ya, si, N'ìhi gini ka unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia nēri ihe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?”