Luke 5:36 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs tụụrụ ha ilu sị, “O nweghị onye na-adọkata akwa ọhụrụ jiri ya dụchie akwa ochie. Ọ bụrụ na o mee nke a, ọ ga-adọwa akwa ọhụrụ ahụ, ma mpempe akwa ọhụrụ ahụ ọ dọkatara, na akwa ochie ahụ agaghị adakọta.
Igbo 2006
O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n'uwe ọhu tukwasi ya n'uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n'uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ tụụrụ ha ilu a, “O nweghị onye na-adọkara akwa ọhụrụ were ya kwachie akwa ochie. Ọ bụrụ na e mee nke a, ọ pụtara na a dọwaala akwa ọhụrụ ahụ nʼihi na nke ahụ eji kwachie ya agaghị adaba.