Luke 5:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Saimọn kpọrọ ndị enyi ha nọ nꞌụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ndị ha kpọrọ bịara nyere ha aka. Ha sepụtara ụgbụ ahụ wụnye azụ ha gbutere nꞌime ụgbọ mmiri ha. Azụ ahụ juru ụgbọ mmiri abụọ ahụ, mee ka ụgbọ mmiri ndị ahụ chọọ imikpu na mmiri.
Igbo 2006
ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n'ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha kpọrọ ndị ọkụ azụ ibe ha nọ nʼụgbọ mmiri ọzọ ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịara kpojuo azụ nʼụgbọ mmiri abụọ ahụ nke malitere imikpu.