Luke 6:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, Jisọs na ndị ozi iri na abụọ ahụ si nꞌugwu ahụ rịdata. Na ndịda ugwu ebe ha guzo, ọtụtụ ndị na-eso Jisọs gbara ha gburugburu, ha na ndị nile si Judia, Jerusalem, na obodo Taịa na Saidọn bịa ịnụ ihe Jisọs na-ekwu, na ndị bịara ka Jisọs gwọọ ha.
Igbo 2006
O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn.