Luke 6:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Oke ahụhụ dịkwa na-eche ndị ọgaranya nꞌihi afọ ojuju nke ha na-enwe ugbu a, agụụ ga-agụkwa ha. Ha na-achị ọchị ugbu a, ma ha ga-akwa akwa, tie aka nꞌobi nꞌiru uju.
Igbo 2006
Ahuhu gādiri unu, ndi afọ juworo ub͕u a: n'ihi na agu gāgu unu. Ahuhu gādiri unu, ndi nāchì ọchì ub͕u a: n'ihi na unu gēru újú kwa kwa ákwá.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a, nʼihi na agụ ga-agụkwa unu. Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a, nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa.