Luke 6:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.
Igbo 2006
Onye ọ bula nke nēti gi aka n'otù ǹti, che-kwa-ra ya nke-ọzọ; onye nānapu kwa oké uwe-gi, eb͕ochila ya inara kwa uwe-ime-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.