Luke 6:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụkwa nanị onye nwere ike ịkwụghachi unu ka unu na-agbazinye ihe, ụdị ihe ọma a abụghị nke e kwesịrị ikele unu ekele nꞌihi ya, nꞌihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmadụ ego, ka onye ha gbazinyere kwụghachikwa ha.
Igbo 2006
Ọ buru kwa na unu ewere ihe binye ha, bú ndi unu nēle anya na unu gānata n'aka-ha, àha ekele gini diri unu? ọbuná ndi-nmehie nēwere ihe binye ndi-nmehie, ka ha we nara kwa nke ra ka ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụkwa na unu agbazinye naanị ndị nwere ike ịkwụghachi unu ihe, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ibe ha na-atụ anya ka a kwụghachikwa ha nʼozuzu oke.