Luke 6:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke were beredi e nyere Chineke dị ka onyinye taa, nyekwa ndị so ya ka ha taa. Ma ọ dịghị onye ọzọ kwesịrị iri achịcha ahụ karịakwa ndị nchụaja.”
Igbo 2006
otú ọ batara n'ulo Chineke, were kwa ob͕e achicha anēche n'iru Chineke rie ya, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ; nke nēzighi ezi n'iwu ka ha rie, ma nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu o si banye nʼụlọ Chineke, were achịcha a na-eche nʼihu ya, nyetụkwa ndị ya na ha so, achịcha nke onye ọbụla na-ekwesighị ịta ma ọ bụghị naanị ndị nchụaja.”