Luke 6:42 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ị̀ ga-esi aṅaa sị nwanna gị, biko kwere ka m tụpụta gị ahịhịa ntakịrị dị gị nꞌanya mgbe ibe osisi dachiri gị nꞌanya adịghị ekwe gị hụ ụzọ? Buru ụzọ wepụta ibe osisi dachiri gị nꞌanya, mgbe ahụ ị ga-ahụ ụzọ nke ọma iwepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nꞌanya.
Igbo 2006
Ma-ọbu ì si aṅa pu isi nwa-nna-gi, Nwa-nnam, kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu nke di n'anya-gi, mb͕e gi onwe-gi nāhughi ntuhie nke di n'anya nke gi? Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi, mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu nke di n'anya nwa-nna-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ị ga-esi aṅaa sị nwanna gị, ‘Nwanna a, ka m wepụ gị ntakịrị ahịhịa dị gị nʼanya,’ mgbe gị onwe gị na-ahụghị obodobo osisi dị gị nʼanya? Gị onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ nke ọma wepụ ntakịrị ahịhịa dị nwanna gị nʼanya.