Luke 6:45 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ezi mmadụ na-esite nꞌakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ihe, otu a kwa ajọ mmadụ na-esite nꞌobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ihe. Nꞌihi na ihe ọ bụla dị mmadụ nꞌobi bụ ihe na-apụta nꞌọnụ ya.
Igbo 2006
Ezi madu site n'ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n'ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n'ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n'ihe nke obi nwebigara ókè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ezi mmadụ na-esite nʼakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ọrụ, otu a kwa, ajọ mmadụ na-esite nʼobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ọrụ. Nʼihi na ihe ọbụla dị mmadụ nʼobi bụ ihe na-apụta nʼọnụ ya.