Luke 6:48 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ ya nꞌelu ntọ ala dị mma, onye gwumiri ala, doo ntọ ala ụlọ ahụ nꞌelu nkume. Mmiri ga-ezo, tojuo iyi nile, meekwa ka ide mmiri sọọ gburugburu ụlọ ahụ, ma ọ gaghị eme ka ụlọ ahụ maa jijiji, nꞌihi na e wukwasịrị ya nꞌelu nkume.
Igbo 2006
o yiri madu nke nēwu ulo, onye gwuru gwumi kwa, we tọ ntọ-ala n'elu oké nkume: mb͕e miri juru, osimiri we tikwasi ulo ahu, ma o nweghi ike ime ya ka ọ me nkpatu: n'ihi na ewuru ya nke-ọma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ahụ yiri nwoke wuru ụlọ, onye gwumiri ala, doo ntọala ụlọ ahụ nʼelu oke nkume. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji nʼihi na e wusiri ya ike.