Luke 6:49 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nꞌelu aja, nke na-enweghị ntọ ala ọ bụla. Mgbe ide mmiri sọrọ ụlọ ahụ gburugburu, ụlọ ahụ na-ada nnọọ gbirigidim!”
Igbo 2006
Ma onye nānu, ma o meghi ha, yiri madu nke nēwu ulo n'elu ala nēnweghi ntọ-ala; nke osimiri tikwasiri, ngwa ngwa o we dakasi; nbibi nke ulo ahu di kwa uku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye ahụ nụrụ okwu m, nke na-ejighị ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke wukwasịrị ụlọ ya nʼelu ala, nke na-enweghị ntọala ọbụla. Mgbe idee mmiri bịara were ike ya tie nʼụlọ ahụ, ụlọ ahụ dara daruo ala, ọdịda ya dị ukwuu.”