Luke 6:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ na-ele Jisọs anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma ọ ga-agwọ nwoke ahụ nꞌụbọchị izuike ka ha site na ya nweta ebubo ha ga-ebo ya.
Igbo 2006
Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Farisii na ndị ode akwụkwọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ọrịa nʼụbọchị izuike.