Luke 6:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube nꞌobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Pụta bịa guzoro nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe Jisọs sị ya guzo.
Igbo 2006
Ma Ya onwe-ya matara ihe ha nātule n'obi; O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, guzo n'etiti. O we bilie, guzo kwa.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe ọ maara ihe ha na-ezube nʼobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Bilie bịa guzoro nʼetiti ebe a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe ahụ.