Luke 7:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs na-abịaru nso nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ, ọ hụrụ ndị mmadụ ka ha bu igbe ozu nke ha na-aga ili. Nwoke e tinyere nꞌigbe ahụ bụ nanị nwa nke nne ya mụtara. Di nwanyị a anwụọkwala.
Igbo 2006
Ma mb͕e Ọ biaruru nso ọnu-uzọ-ama obodo ahu, le, anēbupu otù onye nwuru anwu, bú nwa-nwoke nke nne-ya muru nání ya, nwanyi ahu bu kwa onye di-ya nwuru: oké ìgwè nke ndi obodo ahu soro kwa ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ na-abịaru nso nʼọnụ ụzọ e si abata nʼobodo ahụ, o nwere otu nwoke nwụrụ anwụ nke a na-ebupụ, otu nwa nke nne ya mụrụ. Nne ya ahụ bụ nwanyị di ya nwụrụ, oke igwe mmadụ si nʼobodo ahụ sonyekwara ya.