Luke 7:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs gara nso metụ igbe ozu ahụ aka. Ndị bu ya kwụsịrị. Jisọs gwara nwoke ahụ nwụrụ anwụ okwu nꞌoke olu sị, “Nwokorọbịa, asị m gị si nꞌọnwụ bilie!”
Igbo 2006
O we biaru nso, metu ib͕e ozu ahu aka: ndi nēbu ya we guzo. O we si, Nwa-okorọbia, gi ka M'nāsi, Bilie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ọ gara nso metụ igbe ozu ahụ aka, ndị bu ya kwụsịrị. Ọ sịrị, “Nwokorobịa, asị m gị bilie!”