Luke 7:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Emesịa Jisọs gwara ha sị, “Laghachinụ azụ kọọrọ Jọn ihe unu ji anya unu hụrụ na ihe unu ji ntị unu nụrụ. Kọọrọnụ ya na a na-eme ka ndị kpuru isi hụ ụzọ, na ndị ngwụrọ na-agakwa ije, na a na-emekwa ka ndị ekpenta dị ọcha, na ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, na a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie, na a na-ekwusakwara ndị ogbenye ozi ọma.
Igbo 2006
O we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu huru na nke unu nuru; ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi- ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ zaghachiri ndị ozi ahụ sị, “Laghachinụ azụ gaa kọrọ Jọn ihe unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị kpuru ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-aga ije, ndị ekpenta ka a na-eme ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie, a na-ezisara ndị ogbenye oziọma.