Luke 7:32 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nꞌama na-egwu egwu, ndị na-akpọ ibe ha na-asị, ‘Anyị na-afụrụ unu opi ma unu adịghị ete egwu, anyị na-abụrụ unu abụ ili ozu ma unu adịghị akwa akwa.’
Igbo 2006
Ha yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, nākpọ kwa ibe-ha òkù; ndi nāsi, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi mkpu ákwá.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nʼọma ahịa na-akpọ ibe ha oku na-asị, “ ‘Anyị gburu unu ọja, ma unu adịghị ete egwu. Anyị bụrụ abụ ịkwa ozu, ma unu ebeghị akwa.’