Luke 7:37 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs nọ nꞌụlọ ahụ, otu nwanyị akwụla bi nꞌobodo ahụ onye maara na Jisọs nọ nꞌụlọ onye Farisii ahụ, jiri otu karama mmanụ otite na-esi ezigbo isi bata nꞌụlọ ahụ jee nꞌazụ Jisọs, gbuo ikpere nꞌebe ụkwụ ya dị. Anya mmiri sikwa nꞌanya ya na-awụpụta na-awụkwasị Jisọs nꞌụkwụ. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri a dị nꞌụkwụ Jisọs, werekwa ọnụ ya na-esutu Jisọs nꞌụkwụ. Emesịa ọ wụrụ mmanụ ahụ nile nꞌụkwụ Jisọs.
Igbo 2006
Ma le, otù nwanyi nke nọ n'obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n'ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ.