Luke 7:40 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Jisọs gwara onye Farisii ahụ okwu sị, “Saimọn, ọ dị ihe m chọrọ ịgwa gị.” Saimọn zara ya sị, “Kwuo ihe dị gị nꞌobi, ana m ege ntị.”
Igbo 2006
Jisus we za, si Ya, Saimon, enwerem okwu M'gāgwa gi. O we si, Onye-ozizí, kwue.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.”