Luke 7:42 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe oge ruru ka ndị a kwụghachi ụgwọ ha ji, ha enweghị ego ha ga-eji kwụghachi. Nwoke ahụ gbazinyere ha ego kpọrọ ha gwa ha na ya achọkwaghị ka ha kwụọ ya ụgwọ ahụ, na ọ gbagharala ha ụgwọ ha ji ya. Ugbu a, gwa m, onye nꞌime mmadụ abụọ a ka i che ga-ahụ nwoke ahụ nꞌanya karịa ibe ya?”
Igbo 2006
Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n'etiti ha abua gāhu kari ya n'anya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?”