Luke 7:44 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị lee nwanyị ahụ anya meghee ọnụ gwa Saimọn okwu sị, “Saimọn, ị hụrụ nwanyị a? Mgbe m batara nꞌụlọ gị i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.
Igbo 2006
Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha.