Luke 7:47 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi ihe ndị a nwanyị a mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya nile o mehiere, nꞌihi na ọ hụrụ m nꞌanya nke ukwuu. Ma nwoke ahụ hụrụ m nꞌanya nke nta, ka a ga-agbaghara nanị nke nta.”
Igbo 2006
N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.”