Luke 7:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs sooro ndị okenye ahụ bido ịga nꞌụlọ ọchịagha ahụ. Ma mgbe ha nọ nso nꞌụlọ ya, ha zutere ndị ọchịagha ahụ zitere, ndị gwara Jisọs okwu sị, “Onyeisi anyị ziri anyị ka anyị bịa zie gị ka ị hapụ inye onwe gị nsogbu ịbata nꞌụlọ ya nꞌihi na ya etorughị onye ị ga-abata nꞌụlọ ya.
Igbo 2006
Jisus we so ha ga. Ma mb͕e Ọ nādighi n'ebe di anya n'ulo-ya ub͕u a, ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise we zigara Ya ufọdu ndi-enyì-ya, si Ya, Onye-nwe-ayi, esob͕ula Onwe-gi: n'ihi na erughm ka I ba n'okpuru ulom:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sooro ha gawa. Ma mgbe ọ nọ nso nʼụlọ ya, onye ọchịagha ahụ zipụrụ ndị enyi ya ka ha ga sị ya, “Onyenwe anyị, esogbukwala onwe gị, nʼihi na etorughị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m.