Luke 7:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ sịkwa anyị zie gị na ya onwe ya bụ onye nọ nꞌokpuru ndị dị ukwuu karịa ya, ndị na-enye ya iwu ihe o kwesịrị ime nke ọ na-emekwa. Otu a kwa, ya onwe ya nwekwara ndị nọ nꞌokpuru ya ndị ọ na-ezi ozi ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ sị otu onye gaa ọ na-agakwa, ọ sịkwa onye ọzọ bịa, ọ na-abịa. Ọ bụrụkwa na ọ sị odibo ya mee ihe a, ọ na-eme ya.”
Igbo 2006
N'ihi na mu onwem bu kwa onye edoro n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a ‘gaa,’ ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ ‘bịa,’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a,’ ọ na-emekwa ya.”