Luke 7:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs nụrụ ozi ọchịagha ahụ ziri ka e zie ya, o juru ya anya nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ tụgharịrị lee ndị mmadụ na-eso ya anya sị ha, “Nꞌezie, o nwebeghị oge m hụrụ onye nwere okwukwe dị ka ọchịagha a si nwee okwukwe. Nꞌezie ahụbeghị m ụdị okwukwe a nꞌala Izirel nile.”
Igbo 2006
Ma mb͕e Jisus nuru ihe ndia, o juru Ya anya n'ihi ya, o we chigharia, si ìgwè madu nke nēso Ya, Asim unu, ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a, ọbuná n'Israel.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs nụrụ okwu niile a, o juru ya anya nke ukwuu. Ọ tụgharịrị gwa igwe mmadụ ndị na-eso ya sị, “Asị m unu, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ọ bụladị nʼIzrel.”