Luke 8:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs gara nꞌobodo ukwu nile na nꞌobodo nta nile na-ekwusa ozi ọma alaeze Chineke. Ndị ozi ya iri na abụọ ahụ sokwa ya.
Igbo 2006
O we rue mb͕e nwa oge gasiri, na Ya onwe-ya nāgaghari n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēkwusa nēzikwa ozi ọma ala-eze Chineke, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ọ gara nʼobodo ukwu niile na nʼobodo nta niile na-ekwusa ma na-ewetakwara ndị mmadụ oziọma nke alaeze Chineke. Ndị ozi iri na abụọ ahụ sokwa ya,