Luke 8:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mkpụrụ nke dara nꞌebe ogwu ogwu dị nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke kwere nꞌihe ha nụrụ. Ma oke echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ ha nụrụ. Ha adịghị enwekwa ike nyere ndị ọzọ aka ịmata na ikwere nꞌozi ọma Chineke.
Igbo 2006
Nkpuru nke dara n'etiti ogwu ahu, ndia bu ndi nuru, ma mb͕e ha nāga n'uzọ-ha ncheb͕u na àkù na ihe-utọ nke ndu anākpab͕u ha, ha amighi ezi nkpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ.