Luke 8:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌezi ala nọchiri anya ndị mmadụ jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma gaakwa nꞌihu ime ihe okwu ahụ kwuru. Ndị a na-apụ jiri ntachi obi gbasaa ozi ọma ahụ, rite ndị ọzọ nꞌuru.
Igbo 2006
Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.