Luke 8:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Mmadụ ọ bụla adịghị, nke na-amụnye iheọkụ zoo ya nꞌime igbe ma ọ bụ dọnye ya nꞌokpuru ihe ndina. Kama mgbe mmadụ mụnyere iheọkụ ọ na-adọkwasị ya nꞌelu tebulu ka ndị ọ bụla na-abata nꞌụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.
Igbo 2006
Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n'ihe, ma-ọbu dọba ya n'okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ.