Luke 8:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ dịghị ihe ọ bụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọ bụla mmadụ mere nke ọ dị ka e kpugidere ihe ugbu a, nke mmadụ nile na-agaghị emesịa mata.
Igbo 2006
N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè.