Luke 8:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ụbọchị Jisọs na mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya biliri banye nꞌụgbọ mmiri. Jisọs gwara ha sị, “Ka anyị gafeenụ nꞌofe ọzọ nke osimiri.” Ha kwọliri ụgbọ ha bido ije.
Igbo 2006
O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ọ batara n'ub͕ọ, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya; O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọdọ-miri a ọzọ: ha we nupu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼụgbọ mmiri, ọ sịrị ha, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri.” Nke a mere ha ji nụpụ ụgbọ,