Luke 8:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha nọ nꞌụzọ, Jisọs bidoro ịrahụ ụra. Oke ifufe bidoro ife nke na-ebugharị mmiri ahụ mee ka mmiri bido ịbanye nꞌụgbọ mmiri ha, tutuu ruo mgbe ụgbọ ha chọrọ imikpu.
Igbo 2006
Ma mb͕e ha nēje Ọ da n'ura: oké ajọ ifufe we da n'ọdọ-miri ahu; miri nēju kwa n'ub͕ọ-ha, ha we nọdu n'ọnu ọnwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ma mgbe ha na-aga, ọ rahụrụ ụra. Oke ifufe malitere ife nʼelu ọdọ mmiri ahụ, nke mere na mmiri na-awụbanye nʼime ụgbọ ha, mee ka ha nọrọ nʼoke nsogbu.