Luke 8:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisos jụrụ ndị na-eso ụzọ ya si, “Ebeekwanụ ka okwukwe uni di?” Ma ha tụrụ nnọọ oke egwu sịritaa onwe ha, “Onye ka nwoke a bụ, onye ikuku na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.”
Igbo 2006
O we si ha, Òle ebe ka okwukwe-unu di? Ha we tua egwu, o ju ha anya, ha sirita onwe-ha, Ònye bu kwa Onye a, na Ọ nēnye ọbuná ifufe na miri iwu, ha nāṅa kwa Ya nti?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Ebee ka okwukwe unu dị?” Ha ji oke egwu na oke iju anya jụrịta onwe ha sị, “Onye bụ onye a? Ọ na-enye ọ bụladị ifufe na ebili mmiri iwu, ha na-aṅakwa ya ntị.”