Luke 8:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs si nꞌugbọ mmiri na-arịpụta onye zutere ya bụ otu nwoke obodo ahụ mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Ọ gba ọtọ. O bighị nꞌụlọ ọ bụla, kama ebe o jiri mere ụlọ ya bụ ebe a na-eli ozu.
Igbo 2006
Ma mb͕e O siri n'ub͕ọ puta rigo n'ala, otù nwoke nke si n'obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n'ulo, kama n'ebe anēlì ozu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe o si nʼụgbọ mmiri rịpụta nʼelu ala, otu nwoke obodo ahụ onye mmụọ ọjọọ bi nʼime ya zutere ya. Nwoke a ebighị nʼụlọ maọbụ yie uwe ogologo oge, ma ebe obibi ya bụ ebe a na-eli ozu.