Luke 8:28 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe nwoke a hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nꞌihu ya kwaa akwa nꞌoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs Ọkpara Chineke dị elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ dị ukwuu.”
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n'ala n'iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ hụrụ Jisọs, ọ bịara daa nʼihu ya, tie mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Biko arịọ m gị, atala m ahụhụ.”