Luke 8:29 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nwoke a si otu a kwuo okwu nꞌihi na Jisọs enyela mmụọ ọjọọ ahụ bi nꞌime ya iwu ka o site nꞌime ya pụta. Ọ dị mgbe mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike. Nꞌoge a, ọ bụrụ na e jiri ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ, mmụọ ọjọọ a na-enyere ya akạ ịdọbisi ụdọ igwe ahụ. Ọ na-enyekwara ya aka isi nꞌụlọ mkpọrọ ahụ tikapụta. Ọ pụtakwa, ọ na-eduru ya gaa nꞌọzara.
Igbo 2006
N'ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N'ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n'ọhia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na o nyela mmụọ ahụ na-adịghị ọcha iwu ka o site nʼime ya pụta. Ọtụtụ oge, mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike, nʼagbanyeghị na eji ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, debe ebe a na-eche ya nche, ọ na-adọbisi ụdọ igwe e ji kee ya, mmụọ ọjọọ a na-eduru ya gaa nʼime ọzara.