Luke 8:32 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge ahụ, ọ dị igwe ezi nọ nꞌakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nꞌime ezi ndị ahụ. Jisọs nyere ha ike.
Igbo 2006
Ma ìgwè ọtutu ezì di n'ebe ahu nāta nri n'ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Igwe ezi nọ nʼakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nʼime ha. Jisọs nyere ha ike.